Proverbs 7

Ịdọ aka na ntị banyere nwanyị na-akwa iko

1Na-agbaso okwu m nwa m, nọgide na ya,
dokwaa iwu m niile nʼime obi gị.
2Debe iwu m ka ị dị ndụ,
chee ozizi m nche dịka ọ bụ mkpụrụ anya gị.
3Kee ha na mkpịsịaka gị,
deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị.
4Hụ amamihe nʼanya dịka nwaagbọghọ ị hụrụ nʼanya;
hụkwa inwe nghọta nʼanya dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne gị.
5Kwee ka ha debe gị, ka ị ghara ijekwuru nwanyị na-akwa iko,
ka ị gharakwa ịṅa ntị nʼokwu ire ụtọ ya.

6Nʼihi na otu ụbọchị,
esi m na oghereikuku dị nʼụlọ m lepụ anya,
7hụ nʼetiti ndị na-enweghị uche,
ahụtara m otu nwokorobịa nʼetiti ha,
onye amamihe kọrọ,
8ka ọ na-aga nʼụzọ dị nso ebe nkuku ụlọ
nʼakụkụ ụlọ nwanyị ihere na-adịghị eme,
9nʼoge anyasị, dịka chi na-eji,
mgbe ọchịchịrị na-agbachi.

10Mgbe ahụ, nwanyị ahụ pụtara zute ya.
O yi uwe dịka nwanyị akwụna, jiri aghụghọ na-abịakwute ya.
11(Ọ na-eme ụzụ na-aṅaghị ntị ịnụ ihe ọbụla.
Ụkwụ ya anaghị anọgide nʼụlọ ya.
12Ọ na-akwụgharị ma nʼokporoụzọ ma nʼama;
na-amịgharị nʼebe nzuzo niile.)
13O weere aka ya abụọ jikụọ nwokorobịa ahụ nʼolu, sutu ya ọnụ,
were ihu nke ihere na-adịghị, sị:

14“Emezuru m nkwa niile m kwere taa,
enwekwara m nri nke sitere nʼihe aja udo m chụrụ nʼụlọ m,
15Ọ bụ gị ka m na-achọkwute,
lee gị ka ị na-abịa.
16Agbasaala m akwa mara mma nʼelu ihe ndina m,
bụ akwa ọcha mara mma tụrụ ọtụtụ agwa nke e ji ogho ndị Ijipt kpaa.
17Efesakwala m mmanụ isi ọma nke máá, aloos na sinamọn
nʼelu nʼihe ndina m.
18Bịa, ka anyị were ịhụnanya ṅụjụbiga afọ anyị;
ka anyị mee onwe anyị obi ụtọ site ugbu a ruo ụtụtụ echi.
19Nʼihi na di m anọghị nʼụlọ
o jeela njem dị anya.
20O ji akpa ego juru gaa njem,
abalị ole na ole ga-agafekwa tupu ọ lọta.”

21Otu a ka o si jiri okwu ire ụtọ ya megharịa nwokorobịa ahụ isi tutu o kwenyere ya.
O nwekwaghị ike ịnapụta onwe ya site nʼokwu nrafu nke nwanyị ahụ.
22O sooro nwanyị ahụ dịka ehi
a na-adọkpụ na-aga ebe a ga-egbu ya,
dịka ele
Maọbụ, onye nzuzu
nke na-aba nʼọnya,
23nke na-eche ka e were àkụ gbata ya nʼobi.
Nwoke ahụ dịka nnụnụ nke na-efeba nʼọnya
na-amaghị ihe na-eche ya pụrụ iwepụ ndu ya.

24Geenụ ntị, ụmụ m, ma ọ bụghị naanị ige ntị,
kama meekwanụ ihe m na-ekwu.
25Ekwela ka agụụ nke obi gị chịa gị;
ejela nwanyị dị otu a nso; gbaara ya ọsọ, ka ọ ghara ịnwa gị nwetakwa gị.
26Nʼihi na o mebiela ndụ ọtụtụ mmadụ,
ọtụtụ mmadụ amaala nʼọnya ya.
27Ụlọ ya bụ okporoụzọ nke na-eduba nʼili,
nke na-edubakwa nʼala ọnwụ.
Copyright information for IboBIU